FeaturedIgbo News

Ndị enyi Minista Buharị so na mmadụ 80 ndị FBI bipụtara aha ha maka iri ọrụ: Reno

Views

Reno Omokiri emeela ka a mara na aha mmadụ atọ n’ime ndị Naịjirịa mmadụ iri asatọ (80) ndị FBI bipụtara aha ha maka igwu ndị USA wayo bụ ndị ọyị otu minista  Onyeisiala Muhammadu Buhari họpụtara.

Ndị FBI n’izu ụka gara aga bipụtara aha ndị Naịjirịa iri asatọ(80) a na-enyo enyo na ha gwuru ụfọdụ ndị USA wayo.

N’ozi nke o bipụtara n’igwe mgbasaozi Instagram ya, Reno kwuru sị; ”lelee ihe onyoonyo ndị CNN ebe a gbariri aha ndị FBI nwụchiri maka igwu wayo. ọtụtụ ndị mmadụ nọ na-akatọ otu agbụrụ Naịjirịa ụnyaahụ, mana ebe niile ajụọla oyi mgbe a chọpụtara na aha mmadụ atọ dị n’akwụkwọ ahụ bụ ezi enyi otu minista Mbuhari họpụtara.

Leave a Reply