FeaturedIgbo News

Ndị EFCC anwụchiela ụmụakwụkwọ na OOU, FUNAAB na MAPOLY

Views

Ndị Economic and Financial Crimes Commission anwụchiela ụmụakwụkwọ iri atọ na Moshood Abiola Polytechnic, Federal University of Agriculture nakwa Olabisi Onabanjo University.

Otu a na-ahụ maka mpụ nwụchiri ụmụakwụkwọ na FUNAAB na na MAPOLY, na Wenesde, mgbe ha gara Ibogun Kampus nke OOU, nke dị n’Ifo LGA, Ogun steeti.

Nwa akwụkwọ si OOU, Samson Adeyemi, kwuru na ndị EFCC batara n’ebe obibi ha n’ime abalị Tuzde, ma kpọkọrọ ụmụakwụkwọ iri na asatọ. Ha bukọrọ ụgbọala, ekwentị na komputa ụmụakwụkwọ ndị a. Ndị EFCC kwuru na bụ wayo ịntanetị

E kwukwara na ha mere otu ihe a na Safari, Abule-Ojere, Gbokoniyi, Kemta na Alabata, ebe ụmụakwụkwọ MAPOLY na FUNAAB bi.

E kwukwara na ndị EFCC nwụchiri otu nwa akwụkwọ, onye na-ebe na aka ya dị ọcha, ma ndị EFCC egeghi ya ntị.

Ndị EFCC site n’ọnụ Wilson Uwujaren kwuru anwụchiri ụmụakwụkwọ iri atọ maka ebubo ‘Advanced Free Fraud’. Ha kwuru na ha na-enyocha mmadu iri atọ ndị a.

 

Leave a Reply