Igbo News

Ndi agha ekwuola na ha gburu ndi Bokom Haram

Views

Ndi agha nke Naijiria kwupụtara na Mọndee na ha egbuola mmadu itolu bụ ndi ‘Islamic State of West African Province (ISWAP)’.

Col. Sagir Musa onye ntuziaka ‘Army Public Relations’ kwuru na ndi a egburu bụ ndi otu Boko Haram na-ahụ maka mgbasa ozi nke ‘social media’. Ya mere, ndi Boko Haram agaghịzi enwe ike ikpa mkpamkpa ọ bụla.

Ọ nyekwara aha ndi a egburu dịka: ‘Abu Hurayra al-Barnawi, Ali al-Ghalam al-Kajiri, Abu Musab Muhammed Mustapha al-Maiduguri, Abu Abdullah Ali al-Barnawi, Abu Musa al-Camerooni, Ahmed al-Muhajir, Abu Ali al-Bamawi, Abu Khubayb bin Ahmed al-Barnawi na Abu al-Qa’qa’ al-Maiduguri.

Ndi a na-emekpa mmadu ahụ site n’ isi n’ọba mgbasa ozi agbasa ozi maka gọọmenti Islam nke akpọrọ Caliphate na bekee.

Leave a Reply