Igbo News

‘National Livestock Transformation’ bụ ụzọ ọzọ Gọọmenti etiti si akwalite atụmatụ RUGA: Ndi Ntorobia Biafra

Views

Otu ndi Biafra Nations Youth League (BNYL) kwuru na o nweghi eziokwu dị n’omume gọọmenti etiti ebe ha mechiri okwu Ruga mana akagbughi ya kpam kpam.

BNYL kwuru na echiche Ruga bụ nke atụgharịrị dịka National Livestock Transformation nke bụkwa ụzọ a ga-asị ndi Fulani na-achị ehi ebe obibi na steeti niile ọkachasị ndi dị n’Ọwụwa anyanwu Naijiria.

Nke a bụ ihe ha kwuru n’okwu nke onye ode akwụkwọ ha bụ Comr. Ebuta Ogar Takon nyere ndi Daily Post n’ụbọchị Mọnde. Otu a kwuru na ha ga-eme ihe ọ bụla iji hụ na echiche a abiaghi na mmezu.

Ha kwuru na ọ bụrụ na ndi Northern Coalition achụpụ ndi Igbo nọ n’ugwu (North), na ha ga-achụsisi ndi Hausa/Fulani bi n’Ọwụwa anyanwu Naijiria.

Leave a Reply