FeaturedIgbo News

NANS emechie Shoprite n’Ogun Steeti

Views

Ndi National Association of Nigerian Students na Satọde, emechiela ebe a na-ere ngwa South Africa na Shoprite nke di n’Ogun steeti.

Ndi News Agency of Nigeria kwuru na ụmụakwụkwọ gara ebe ahụ ime ngagharị iwe maka otu e si egbu ndi Naijiria na South Africa.

Emechiri Shoprite mgbe o jiri ọkara gafee elekere iri na otu nke ụtụtụ, ebe ndi uwe ojii nọ ma na-enyere ndi na-azụ ahịa aka ịhụ ụzọ ọpụpụ.

Ndi NANS kwuru na ebe ndi South Africa na-enwe aṅụrị n’ogbugbu ha na-egbu ndi Naijiria, na ha ga-agba mbo hụ na ha mechiri ụlọ ahịa niile nke South Africa nwe.

Leave a Reply