FeaturedIgbo Culture

Naijiria na Russia enwela nkwekọrịta ọhụrụ

Views

Naijiria na Russia, na Tọzde, na Sochi, Russia, binyere aka n’akwụkwọ Memorandum of Understanding (MoU), nke ga-eme ka ụlọ ọrụ na-ahụ maka mmanụ n’obodo ndị a; Nigeria National Petroleum Corporation na Lukeoil nke Russia, rụkọọ ọrụ.

Malam Shehu Garba, Onye enyemaka Onyeisi ala n’ihe gbasara ozi na ọha, kwuputara nke a n’Abuja.

O kwuru na NNPC na Lukeoil ịrụkọta ọrụ ọnụ ga-enye aka imezi na ịrụgharị ebe ndị a na-emepụta na Naijiria.

O kwukwara na ndịisi ụlọ ọrụ NNPC, Mele Kyari na Vagit Alekperov, nakwa onyeisi Lukeoil binyere aka na ya na bụ MoU.

E binyere aka n’akwụkwọ a na Russia Africa Summit, nke Minista na-ahụ maka mmanụ na Naijiria, Timipre Sylva bụ onye akaebe.

Onyeisi ala Muhammadu Buhari na ya bụ emume kwuru na ndị Naijiria dị njikere ha na ndị Russia ịrụkọta ọrụ nke ga-enye aka imezi arụmọrụ ebe a na-emepụta mmanụ.

 

Leave a Reply