Igbo News

Naijiria anọghị n’ụjọ Ebola: NCDC

Views

Ụlọ ọrụ Nigeria Center for Disease Control (NCDC) agwala ndi Naijiria ka obi sie ha ike maka ọrịa Ebola. Ọ sịrị na enweghi ụzọ ọrịa ga-esi bata Naijiria. O kwuru na obodo Uganda na Republic of Congo bụ ebe ọrịa na-egbu ọtụtụ mmadu nakwa na enweghi ụzọ jikọrọ obodo ndi a na Naijiria. Nke a mere na ọ ga-ara ahụ ibubata ọrịa na Naijiria.

Ha kwuru na ha ekeela nkwucha, ya mere onye ọ bụla atụla ụjọ maka na ha adịla nkwadobe. Onye tinyere aka n’akwụkwọ ozi a bụ Joshua Obasanya. O kwuru na ụlọ ọrụ ha ewepụtala ụzọ di iche iche iji ebuso ya bụ ọrịa agha ma kwukwa na ụlọ ọgwụ ebe a na-agwọ ọrịa Ebola nọkwa na njikere maka ihe mberede ọbụla.

Joshua kwuru na ha ebidola ime ihe a na-akpọ Infection Preventive Control (IPC)  n’ebe niile na Naijiria.

Leave a Reply