FeaturedIgbo News

N-Power: Ihe debanyere aha n’afọ a karịrị Mmadụ nde ise (5m) – Sadiya Farouq

Views

Minista na-ahụ maka nkwalite ebimndụ na nlekọta ihe mberede bụ Hajiya Sadiya Umar Farouq emeela ka a mara na ndị Naịjiria debanyere aha ha maka iwe n’ọrụ gọọmentị wepụtara iji kwalite ebimndụ ndị enweghi ọrụ  a kpọrọ N-Power, akarịala nde ise (5million) n’ọnụọgụgụ.

O mere ka a mata nke a site n’ọnụ onye nnọchianya ya n’ihe banyere mgbasaozi bụ Odoziakụ Halima Oyelade.

O mekwara ka a mata na ndebanye aha a nke bidoro na Juun 26, kwesịrị ịkwụsị na Julai 26, mana e nyekwuru ndị mmadụ amara izuụka abụọ.

O mere ka a mara na ọnụọgụgụ ndị ntorobịa debanyere aha mgbe e mechiri ndebanye aha, dị 5, 042, 001 (nde ise, puku iri anọ na abụọ, mara otu onye).

N’okwu nke ya, “… a ga-agbaso ezi usoro na nhọpụta a ga-eme na-agba ndị ọzọ na-eso iji hụ na ọ bụ ndị kwesịrị ekwesị ka e nyere ọrụ.”

“A ga-emekwazi ka ndị debara aha ha, na ọha mmadụ mara ma e bido nnyocha, nakwazi usoro a ga-agbaso ma abanye agba nke na-eso nhọpụta a”

Dịka Oyelade siri kọwa, e wepụtara ọrụ a iji nye ụmụntorobịa Naịjiria ohere inwete nnu na ose na-enyere mmadụ aka inweta ọrụ maọbụ iji zọba onwe ya.

5 Comments

Leave a Reply