FeaturedIgbo News

Mmadu karịrị puku iri egosi mmasi n’ọrụ Kọmishọna n’Ebonyi

Views

Mmadu kariri puku iri n’Ebonyi Steeti edetala akwụkwọ maka ọkwa ndi Kọmishọna, Senior Special Assistants (SSAs), Special Assistants (SAs) na ọkwa ndi ọzọ ndi ga-eso Gọvanọ Dave Umahi arụ ọrụ.

Gọvanọ kwuru nke a ma gosi mwute ya n’ihi na ọtụtụ mmadu chọrọ ọkwa di elu kama ha ga-ebido na ndi obere dika Technical Assistants, Senior Technical Assistant na Development Center Cordinator.

Gọvanọ Umahi kwuru na nke a anaghị enye ya obi aṅụrị ma ncha. O kwukwara na ụfọdụ n’ime ha amaghi ihe ọrụ ndi a pụtara. Ọ gwara ha ka ha chọọ ọrụ ebe ọzọ na ya agaghị enye ụfọdụ n’ime ha ọrụ ma kwuo na ọrụ kọmishọna bụ ọkwa ikpeazu ọ ga-enye na Steeti ya.

O kwukwara na ndi mbu soro rụọ ọrụ emeghi nke ọma kama ha na-agba gọọmenti ya mgba okpuru.

Leave a Reply