FeaturedIgbo News

Mmadụ atọ anwụọla ka ndị oji egbe ezu wakporo osote gọvanọ Nasarawa

Views

Ndị oji egbe ezu wakporo osote gọvanọ steeti Nasarawa , Emmanuel Akabe na ndị otu ya, gbuo ndị uwe ojii atọ na otu onye ọzọ.

Mazị Akabe na-aga Abuja mgbe ndị ya na ha so gbakwuuru ndị omekome ka ọ fọrọ obere ihe ka ha ruo Akwanga n’ihe dị ka elekere isii nke mgbede.

Usman Samaila, onye na-ahụ maka mmekọrịta ndị uwe ojii nke steeti, mere ka akụkọ a ruo ndị  News Agency of Nigeria (NAN) ntị na Lafia.

Mazị Samaila enyeghị nkọwa zuru ezu, na-ekwu na onye isi ndị uwe ojii, Bola Longe duuru ndị otu ndị ọrụ gaa ebe ahụ iji chọpụta ọnọdụ ahụ.

Mazị Samaila kwuru, “Ka m na-agwa gị okwu ugbu a, Kọmịshọna ndị uwe ojii, ndị osote onye isi ọrụ na ndị uweojii ndị ọzọ nọ n’ọkwá dị elu agaala ebe ya bụ ihe mere”

Ha mere ka amata na ọ bụ ndị ohi ahụ bu ụzọ gbaa ha egbe tupu ha amanye is n’ọhịa.

Dịka o siri kwuo, ndị ohi ji egbe gbagburu ndị uwe ojii atọ na otu ọkwọ ụgbọ ala. E tinyela ozu ha n’ụlọọgwụ Dalistu Araf Specialist Hospital Lafia.

E mere ka a mara na ọkọ akọghị osote gọvanọ ahụ mana ụjọ ihe dakwasara ya ka dị ya n’ahụ. E bugara n’ụlọ ọgwụ mana ọ gwaghị ndị nta akụkọ ihe ọ bụla banyere ihe gabigara.

Leave a Reply