FeaturedIgbo News

Mmachị mbata obodo US nyere ndi ọchịchị Naijiria gosiri na mpụtara ntuli 2019 bụ ụgha: Atiku

Views

Onye pụtara maka ọkwa onyeisi ala n’okpuru Peoples Democratic Party nke ntụli Febụarị, Atiku Abubakar ekwuola na mmachi njem nke ndi United States nyere ụfọdụ ndi ọchịchị Naijiria mere ka amata na ntụli nke onyeisiala e mere bụ nke laara All Progressive Congress na Muhammadu Buhari.

O kwuru nke a site n’ọnụ Mz. Paul Ibe na Wenezde. Atiku kwuru na mpụtara ntụli e mere bụ ugha mana gọọmenti nke Buhari ekweghi ekweta na ntụli ahụ agaghị nke ọma. Dịka onye nkwuchite ọnụ nke US State Department, Morgan Ortagus siri kwuo, mmachi a gbasaara ndi ọchịchị niile, ndi agwa ha na omume na-emegide ọchịchị onye kwuo uche.

Atiku kelere obodo US maka ịkwụnyere ndi Naijiria ma megide ndi ọ bụ ebumnobi ha bụ imebi iwu ọchịchị onye kwuo uche ya. Ọ gwara ndi Naijiria ka ha kee aji n’ume n’ihi na ahụhụ ha niile ga-abịa na njedebe n’oge na-adighi anya.

Leave a Reply