FeaturedIgbo News

Miyetti Allah arịọ Gọọmentị enyemaka mgbochi ọrịa

Views

Otu Miyetti Allah Cattle Breeders Association of Nigeria, MACBAN, arịọla gọọmentị ka o nyere ha aka wepụta ọgwụ mgbochi a na-enye ehi maka ntiwapụta ọrịa nke ha kpọrọ Contagious Bovine Pleuropneumonia, CBPP.

Onye ode akwụkwọ ndị MACBAN, Alhaji Othman Ngelzerma, kwuru nke a na nzukọ ya na ndị nta akụkọ nwere maka ntịwapụta ọrịa na Bauchi na FCT, na Wenesde, n’Abuja.

Ngelzarma kwuru na ọrịa eriela ihe karịrị ehi puku abụọ na steeti ndị a, na-erubeghi ọnwa abụọ.

O kwukwara na ọ bụrụ na gọọmentị emeghi ihe ọ bụla, na ya bụ ọrịa ga-agbasa ruo Nasarawa na steeti ndị ọzọ

 

Leave a Reply