FeaturedIgbo News

Minista nke Finance ekwela nkwa itinye ego zuru oke maka ịrụ ọrụ n’afọ 2020

Views

Minista nke Finance na Naijiria, Odz. Zainab Ahmed, kwere otu ndi omeiwu ndi na-ahụ maka ego ọrụ (appropriation) nke afọ 2020 nkwa itinye ego zuru oke maka ọrụ ndi atụpụtara.

O kwere ha nkwa a na nzaghachi ajụjụ nke ndị omeiwu jụrụ. Ndị omeiwu jụrụ ya gbasara ụzọ ndị isi ọchịchị ga-esi enweta ego ndị edepụtara maka ime ihe ndị dị n’akwụkwọ mmefu ego.

Zainab kọwara ha na gọọmentị ga-eme ihe niile ha kwesiri ime iji hụ na emezuru ihe niile edepụtara na a ga-eme n’akwụkwọ mmefu ego nke 2020.

O kwukwara na gọọmenti ga-akwagide emume ‘Social Reinvestment Programme’, nke a ga-eji belata ọnọdụ ụbiam nke obodo a. O kwuru na-ewepụtala ijeri naira iri asatọ (#80bn) maka emume a.

Zainab kwukwara na gọọmentị etiti ga-ezere oke mmefu ego ọkachasị n’ihe gbasara ọrụ na-adịghị n’akwụkwọ mmefu ego nke 2020.

A na-atụ anya na Onyeisi ala Muhammadu Buhari ga-ewepụta ego ọrụ a na nzukọ ndi omeiwu, n’ụlọ omeiwu, n’izu ọzọ.

Leave a Reply