Igbo News

Mahadum UNIZIK achụọ onye nkuzi ji asambodo adigboroja nweta ọrụ

Views

Mahadum Nnamdi Azikiwe achụọla onye nkuzi a na-akpọ Dr. Peter Ekemezie maka iji asambodo adigboroja nweta ọrụ ma dekwaa akwụkwọ ndi ọzọ dere dịka nke ya.

Ekemezie bụ onye nkuzi nwere ọkwa di elu na ngalaba Pure and Industrial Chemistry. dịka akụkọ kwuru, otu ndi omeiwu nke mahadum a enyela iwu ka onye nkuzi a kwụsị ihe niile ọ na-eme n’ụlọ akwụkwọ ma nyeghachị ha ihe niile gbasara ụlọakwụkwọ ahụ nke o ji, ma nyekwa iwu ka ọ kwụsị ịbata ụlọakwụkwọ ha.

Ekemezie bụ onye nwetara ọrụ n’afọ 2010. N’afọ 2013, otu nwaanyi a na-akpọ Egolum boro ya ebubo ịnara ya ego ka o nwee ike nweta nnabata ịgụ akwụkwọ na Mahadum nke Port Harcourt. Mgbe elebara anya n’okwu a ka achọpụtara na asambodo nke o ji nweta ọrụ bụ adigboroja.

Onyeisi ndi omeiwu nke mahadum a bụ Azeez Bello kwuru na Ekemezie dere akwụkwọ nye kọmishọna ndi uwe ojii n’Anambra Steeti, na-ekwu na ndi nkuzi ibe ya na-agba ya mgba okpuru. Ndi uwe ojii lebara anya n’okwu a, ma hụ na o nweghi eziokwu dị na ya.

Leave a Reply