Igbo News

Mahadum UNIPORT ajụla inye ụmụakwụkwọ asambodo ha

Views

Mahadum nke Port Harcourt bụ ndi ụlọikpe kpọrọ oku n’oge gara aga maka na ha ekweghi enye ụmụakwụkwọ ndi si na mahadum ha pụta asambodo n’ihi na ha akwụghị ụgwọ akwụkwọ ha n’oge n’afọ 2016.

Ụmụakwụkwọ nke ruru otu puku, nari abụọ na iri abụọ na asaa kpọpụrụ mahadum a ụlọikpe; ebe ha meriri na ya bụ ikpe. Ụlọ ikpe nyere mahadum a iwu ka ha nye ụmụakwụkwọ ndi a asambodo ha, ma ruo taa, Mahadum nke Port Harcourt ajụla ime ihe e nyere ha n’iwu.

Otu nwoke nke aha ya bụ Deji Adeyanju, onye omume a na-ewute n’obi, akpọọla Mahadum a ka ha nye ụmụakwụkwọ ndi a asambodo ha. O kwukwara na ụmụakwụkwọ ndi a gụchara akwụkwọ kemgbe afọ 2016 ma ha enwebeghi ike ịga fee ala nna ha ma ha enwekwaghi ike inweta ezigbo ọrụ.

Leave a Reply