FeaturedIgbo Culture

Mahadum Taraba achụpụla nwa akwụkwọ maka ịkọcha Gọv. Ishaku na Facebook

Views

Mahadum nke Taraba Steeti achụọla nwata akwụkwọ maka ịkọcha gọvanọ steeti, Darius Ishaku (PDP) na Facebook.

Joseph Israel, onye anabatara na Mahadum a ịgụ Chemistry, onye mechara gbanwee gụwa Laboratory Science, kwuru na achụpụrụ ya na Mahadum a maka na ebinyeghi aka n’akwụkwọ nke matriculation oath.

Leta nke enyere Israel, nke osote Registrar agụmakwụkwọ binyere aka na ya, boro nwata akwụkwọ a ebubo na ọ bịaghị emume matriculation nakwa na o binyeghi aka n’akwụkwọ matriculation oath.

Mahadum kwukwara na achụpụrụ nwata akwụkwọ a maka na o mezughi usoro ndebanye nke Mahadum Taraba Steeti.

Mana otu nwoke a na-akpọ Jen Jubrin, gwara ndi Premuim Times na ihe mere e jiri chụpụ nwata akwụkwọ bụ maka nkọcha ọ na-akọcha gọvanọ na soshal midia.

E nyochara Facebook Israel wee chọpụta n’ezie na o na-akọcha gọvanọ.

N’April 26, Israel dere na Facebook:

Ọ bụrụ na Gọv. Darius ere ụgbọala asaa site n’ụgbọala o nwere, ọ ga-eji ya egbo mkpa Taraba State University.

Leave a Reply