FeaturedIgbo News

Mahadum nke steeti ahụsiela anya maka enweghi ego

Views

N’ihi mbelata ego nke gọọmentị etiti belatara ego a na-enye gọọmentị steeti, gọọmentị steeti anaghịzi enye mahadum steeti ego ha ga-eji na-arụ ọrụ.

Nchọcha e mere gosiri na ọtụtụ gọọmentị steeti ebelatala ego ha na-enye mahadum ha, ebe ndị ụfọdụ anaghịzi enye ha ego cha cha n’ihi ọnọdụ akụ na ụba nke obodo a.

N’ihi enweghi ego, ọtụtụ mahadum steeti na-ahụ nwim tụpụ akwụọ ndị ọrụ ụgwọ. Ụfọdụ n’ime ha anaghịzi eme ihe e ji maka ya a ga akwụkwọ; ezi nkuzi adịghịzi.

Onyeisi oche ndị Academic Staff Union of Universities na Akwa Ibom State University, Mz. Imeh Okop, gwara ndị Punch n’ajụjụọnụ a gbara ya na gọọmentị steeti na-agba mbọ ịkwụ ụgwọ mana ebe ọ ka njọ bụ n’ihe gbasara akụrụngwa na itinye ndị mmadu n’ọrụ.

N’otu aka ahụ, Ondo steeti nwere Mahadum atọ nke gụnyere: Adekunle Ajasin University Akungba-Akoko, Ondo State University of Science and Technology, Okitipupa, na University of Medical Sciences, Ondo. Mahadum atọ ndị a na-ebe akwa ego.

Mahadum nke steeti ndị dị na Katsina, Gombe, Kwara, Ekiti, Ebonyi na ndị ọzọ na-ekwukwa otu okwu a.

Leave a Reply