Igbo News

Mahadum Nigeria Nsukka; VC Igwe

Views

Okz. Charles Arizechukwu Igwe dịka onye ahọpụtara maka okwa onye ọchịchị ya bụ ‘Vice Chancellor’ nke ‘University of Nigeria, Nsukka’ ṅụrụ iyi iba n’ọkwa ya n’ụbọchị iri nke ọnwa Juun, 2019.

Okz. Charles bụ onye ahọpụtara ka ndi otu na-ahụ maka ọchịchị nke UNN mechara nyocha. Ndi ọkankuzi iri isii na anọ pụtara maka ọkwa a mana ka emechara nyocha, Okz. Charles Igwe gbara onye nke mbu, ebe Okz. James Ogbonna gbara onye nke abụọ ma Okz. Cyprian Onyeji gbara onye nke atọ. Dịka Charles Ebizie bụ osote ‘Registrar’ nke otu ọchịchị mahadum siri kwuo, ntuliaka e mere gbasoro usoro kwesiri n’enweghi nsogbu ọ bụla.

Okz. Charles Igwe bụ ọkankuzi nke ‘soil science’. Ọ bụ onye Ọka nke di n’Anambra Steeti. A mụrụ ya n’Ọgọọstụ n’afọ 1958. O nwere asambodo ‘Ph.D, M.Sc’ na ‘B.Agric’ na Soil science na Mahadum nke Naijiria, Nsukka. O nwetakwara ‘Postgraduate Diploma’ na Mahadum nke Norway. Ọ rụrụ ọrụ dika onyeisi ngalaba na onyeisi fakọọltị na oge di iche iche.

Nyocha Okz. Igwe gbakwasara ụkwụ na ‘Organic and Mineral collids in the stability of tropical soil’. Nyocha niile o mere nyere aka n’agumakwụkwọ. O deela ma bipụtakwa ọtụtụ akwụkwọ nke gbakwasara ụkwụ na Soil/ Environmental Science.

O nwetara ihe onyinye di iche iche nke sitere na Naijiria na mba ụwa ndi ọzọ. Ọ lụrụ nwaanyi ma mụtakwa ụmụ atọ.

Leave a Reply