Igbo News

Mahadum Michael Okpara: Ewedala Ọkankuzi iri atọ na atọ

Views

Otu na-ahụ maka nlekọta na ime iwu nke mahadum Michael Okpara dị n’ Abia Steeti ewedala ndi ọkankuzi iri atọ na atọ n’ọkwa ọkankuzi ma nyekwa ha ọkwa dị ala. Ha mere mkpebi a na mkparita ụka nke iri abụọ na otu nke ha bidoro n’ụbọchị Mọnde iri na atọ ruo n’ụbọchị Tọọzde iri na isii nke ọnwa May.

Onye kwuru nke a bụ Nwaada Jacinta N. Ogwo-Agu bụ Registra nke mahadum. Ọ sịrị na ihe ha ji mee nke bụ maka mkpesa ụfọdụ ndi nkuzi wetere. Ihe mere e ji leba anya n’okwu a bụ maka ozi ministri na-ahụ maka agụmakwụkwọ wetara gbasara mkpesa ndi nkuzi a.

Onye nkwuchite ọnụ nke mahadum a bụ Nwaada Adamma Odefa na nweda ewedara bụ n’ọkwa ha kwesiri i nọ na mbu. O kwuru na ndi na-elekọta mahadum ebidola ịhazi ihe ụfọdụ otu o kwesịrị na mahadum. Ndi mkpebi a gbasara enwetala ozi maka ọkwa ọhụrụ ha kwesịrị ị nọ.

Leave a Reply