Igbo News

Mahadum Abuja enwee onyeisi ọhụrụ

Views

Mahadum nke Abuja enweela Onyeisi ọhụrụ nke aha ya bụ Ọkz. Abdul-Rasheed Na’allah. Ọkz. Na’allah bụbu onyeisi Mahadum nke Kwara Steeti(KWASU), mana ọrụ ya gwụrụ na KWASU n’ụbọchị mbu nke ọnwa Julai.

Mgbe a na-eme emume ịnabata ya n’ọfiisi, o kwuru na mahadum Abuja ga-abụ nke ga-emepụta ụmụakwụkwo ga-aba uru n’obodo Naijiria; ndi ga-enye aka ime ka enwe akụ n’obodo.

Onyeisi ọhụrụ a bụ Na-allah nwetara BA n’English na Mahadum Ilorin n’afọ 1988 ma nweta MA na Literature na otu Mahadum ahụ n’afọ 1992. O mechara bụrụ ọkankuzi nakwa onyeisi oche African Studies na Mahadum Western Illinoiss tụpụ ọ bụrụ onyeisi ndi KWASU.