Igbo News

Lawan anabata Rochas Okorocha dika onye omeiwu

Views

Onyeisi ụlọ omeiwu nke Naijiria bụ Ahmed Lawan ehiwela Rochas dịka onye omeiwu ga-anọchite anya ndi Imo West. Rochas Okorocha bụ gọvanọ chịburu Imo Steeti.

Ndi ụlọọrụ na-ahụ maka ndorondoro ọchịchị na Naijiria bụ INEC enyela asambodo ịchị ọchịchị nke ha jụrụ inye ya kembge ọnwa abụọ. E kwuru na Okorocha bụ onye meriri na ntụliaka emere n’ụbọchị iri abụọ na atọ n’ọnwa Febụwarị.

Ụlọ Ikpe nke gọọmenti etiti kwuru na Mọnde na ụlọọrụ INEC enweghi ike ịnapụ Rochas asambodo ịchị ọchịchị ma nyekwa iwu ka enye ya asambodo ya.

Leave a Reply