Igbo News

Laghachi ụlọ akwụkwọ ka inweta ezigbo asambodo: Obasanjo

Views

Olusegun Obasanjo onye bụbu onyeisiala Naijiria agwala onyeisiala Muhammadu Buhari ka ọ laghachi ụlọ akwụkwọ ga nweta ezigbo asambodo. O kwuru na ọ bụ ihe kwere omume, ebe ya bụ Obasanjo laghachiri ụlọ akwụkwọ n’oge nke ya.

Dịka Obasanjo kwuru n’ụbọchị Wenezde, o nyere Buhari ndumọdụ ka o kwere na ya enweghi asambodo agụmakwụkwọ ọ bụla n’ihi na ndi Naijiria niile amatala na asambodo WAEC o wepụtara bụ adigboroja.

O kwuru na ọ bụrụ na ụlọ ikpe a wetara iwu a tụpụ emee ntụliaka, agaraghi ehibe Buhari dịka onyeisiala. Obasanjo kwuru na ụdị omume a mere na ire ure obodo agaghị akwụsị.

O kwukwara na obodo a bụzi ihe a na-akatọ na mba ụwa niile, nke mere ụmụ okorobia ji ahapụ obodo a agbabanye  obodo ọzọ.

Leave a Reply