FeaturedIgbo News

Gọọmentị egbutusịa Osisi maka ndị omekome?

Views

O nwere onye na-amaghị uru osisi bara? Kedu ihe mere ndi ọchịchị anyị jiri chee na igbutụsi osisi ga-azọ anyị n’aka ndi Fulani?

Nyocha e mere gosiri na ndi uwe ojii nke Edo Steeti kpọtara katapila ise nke na-egbutu osisi ebe ha na-agba mbo ịhụ na-achọpụtara ebe ndi ntoro mmadu a zoro.

Ọzọkwa, gọvanọ ise nke ‘South East’ ekpebiela na ha ga-egbutu osisi ndi nọ n’ụzọ ebe ndị ntọrị a na-akpa mkpa mkpa. Ha chepụtara nke a ka ndi uwe ojii nke Ogun Steeti zọpụtachara mmadu ise atọọrọ n’Ijebu Ode.

Ndi Vanguard Newpaper kọwara na ụdị emume a adịghị mma n’ihi na ọtụtụ ihe ga-emebi ma ọ bụrụ na egbutusiwa osisi otu a. Ha kwuru na ọ dị mkpa ibuso ndi omekome ndi a agha mana ekwesighi ka egutusia osisi ndi anyị si na ya enwete ọtụtụ ihe.

Ha rịọrọ ndi nchekwa obodo ka ha jiri ụzọ ọzọ, ọ chasị n’ụzọ nka na ụzụ, buso ndi a agha.

Leave a Reply