FeaturedIgbo NewsSports

Kanụ Nwankwọ enweta ọkwa ọhụrụ

Views

Gọvanọ Imo Steeti, Emeka Ihedioha ekwuputala na onyeisi otu Super Eagle nke gara aga, Kanu Nwankwo, abụrụla onye enyemaka ya n’ihe gbasara egwuregwu.

Ihedioha kwuru nke a na Wenesde n’ụlọ gọọmentị nke dị n’Owerri, dịka onye enyemaka gọvanọ n’ihe gbasara mgbasa ozi, Izuchukwu Akwarandu siri kwuo.

N’okwu Akwarandu, Papilo dịka a na-akpọ Kanu, gara igosi Ihedioha nturu ugo nke CAF ọ natara, ya na akwa ndi bọlụ edere aha Gọvanọ Imo Steeti.

Mgbe Gọvanọ na-anabata Kanu Nwankwo ka o nyere ọkwa ọhụrụ a; ‘Senior Special Assistant’ maka ihe gbasara egwuregwu.

Leave a Reply