Igbo Culture

Ka ndi ntorobia si egbu onwe ha na-enyezi nsogbu: NYCN

Views

Ndi otu National Youth Council of Nigeria (NYCN) akpọọla gọọmenti etiti ka ha wepụta otu ga na-ahụ maka otu ndi mmadu si egbugasị onwe ha n’obodo a.

Mz. Bello Shagari bụ onyeisi otu a rịọrọ nke a n’okwu o kwuru na Sokoto n’ụbọchị Sọnde. N’okwu a, o gosiri nwute ya n’ụdị ọnwụ ndi ntorobia na-anwụ ugbu a. O kwukwara na mmadu igbu onwe ya abụghị ihe ọtụtụ omenala na-anabata. Nke a mere ọ na-arịọ ndi ntorobia ka ha kwụsi igbu onwe ha n’agbanyeghi ọnọdụ ha nọ.

O kwukwara na ụdị ụkọ na enweghi ego dị n’obodo nwere ike ime ka mmadu mee ihe na-ekwesighi. Mana, ọ riọrọ ka ha nwee ndidi na gọọmenti na-anwa ike ya ịhụ na ihe ga-adimma n’ọdịnihu.

Ọ gara n’ihu rịọkwa gọvanọ, ndi isi obodo, na ndi isi ụka ka ha tinye aka n’ụzọ kwesirinụ iji hụ na e belatara ihe ọjọọ.

 

Leave a Reply