Igbo News

Jonathan enweta ọkwa ọhụrụ

Views

Onyeisi ala chịbụrụ Naijiria bụ Goodluck Jonathan abụrụla onyeisi oche ndi ‘African Union’s International Summit Council for Peace (ISCP)’. N’ ọgbakọ otu mba ụwa na Johannesburg, South Africa ka o nwetara ọkwa a. ISCP bụ otu jikọtara ndi isi ala chịbụrụ na mba Afrika.

N’okwu nke Goodluck kwuru, nke isiokwu ya bụ ‘the need for a governance and peaceful electioneering process in Africa’, ọ gbara otu mba Afrika a ume ka ha wepụta ukpuru onye ọ bụla nabatara maka ihọpụta ndi isi komishion ntuliaka.

O mere ka ha mara na ukpuru a ga-enye aka ime ka enwee ntuliaka nke mpụ na-adighi na mba Afrika niile; ka ọ ga-abụ, mgbe a ga-enwe ntuliaka na mba ọ bụla, ndi na-azọ ọnọdụ ọchịchị ọ bụla ga-enwe obi siri ike na ntukwasi obi na ndi na-ahụ maka ọrụ ntuliaka.

Leave a Reply