Igbo News

JAMB 2019: Mahadum Ibadan anabataghị akara nnabata otu narị na iri isii

Views

Ndi isi mahadum Ibadan ekwuola na akara nnabata e ji abanye ụlọakwụkwọ ha ga-abụ narị abụọ megide ihe ụlọ ọrụ JAMB kwuru gbasara ibanye mahadum.

N’ụbọchị Tuuzdee gara aga, ụlọ ọrụ JAMB kwuru na akara nnabata e ji abanye mahadum nke gọọmenti etiti ga-abụ otu nari na iri isii. Mana ụfọdụ ndi ọkammụta akatọla mkpebi a n’ihi na akara a dị obere iji aba mahadum.

Mahadum nke Ibadan ekwuola na ha agaghị eso ihe JAMB kwuru. Onye isi mahadum a bụ Ọkz. Idowu Olanyinka sịrị na ọ chọghị ihe ọ bụla ga-agbagwoju ndi bu n’obi ibata mahadum Ibadan anya; na mahadum Ibadan ga-enwe akara nnabata narị iri abụọ. Ọ sị na nke a bụ mkpebi ndi omeiwu nke mahadum ha.

Leave a Reply