FeaturedIgbo News

JAMB 2019: Enweela Akara Nnabata otu narị na iri isii maka ibanye Mahadum

Views

Ndi ọkachamara n’ihe banyere akara nnabata nke eji abanye mahadum nwere nzukọ nke iri na itolu gbasara mbepụ ụmụakwụkwọ ga-enwe iji banye mahadum. Ha nwere ọgbakọ a na Bola Babalakin Auditorium, Gbongan, Osun Steeti.

Ha ekpebiala na mbepụ a ga-eji banye mahadum nke federal bụ otu nari na iri isii (160) ma nke e ji abanye mahadum nke onwe bụ otu nari na iri anọ (140).

Maka polytechnic nke federal, mbepụ ga-abụ otu nari na iri abụọ (120) ebe mbepụ maka polytechnic nke onwe ga-abụ otu nari na iri (110). Maka ndi College of Education, mbepụ ha ga-abụ otu nari (100).

Ndi biara ọgbakọ a bụ ndi isi mahadum niile, ndi isi polytechnic na ‘college of education’; ebe onye isi ọgbakọ a bụ onye isi nlekọta ụlọọrụ JAMB bụ Prof. Ishaq Oleyede.

Ụlọọrụ JAMB kwuru na o nweghi nwa akwụkwọ nwere rezọọtụ abụọ ma si na onye ọ bụla nwere rezọọtụ karịrị otu bụ onye ghọrọ aghụghọ n’ule.

Leave a Reply