FeaturedIgbo News

Ịrụchapụ akwa mmiri Niger ga-enye nsogbu maka agwa ndị obodo

Views

Ọrụ akwụsịla ebe a na-arụ akwa mmiri nke abụọ, nke Niger, maka na ndị bi n’akụkụ ebe a na-arụ ọrụ na-achọ arụmarụ ruru nde nari naira ise, ebe ndị ọrụ na-achọkwa ka amụba ụgwọ ọnwa ha.

Onye ntụziaka Federal Minstry of Works n’Anambra steeti, Adeyemo Ajani, kwuru na ịrụchapụ akwa mmiri ga-ara ahụ ma ọ bụrụ na gọọmentị etiti etinyeghi ọnụ n’okwu a.

Ajani kwuru na e wepụtala ego niile e kwesiri iji arụ akwa mmiri a, mana ndị n’obodo ebe a na-arụ akwa mmiri ga-egbochi nrụcha ya.

Ụfọdụ obodo ndị dị n’Anambra na Delta, akwụsịla ọrụ akwa mmiri a ma na-ekwu na gọọmentị enyebe ha oke ruru ha.

Leave a Reply