Igbo News

Ihe ndị ọchịchị ga-eme ka e nwee ike ịgbaghara ha: IPOB

Views

Ndị Indigenous People of Biafra (IPOB) akpọkuola ndị Igbo ji ọkwa ọchịchị ka ha chegharịa ka enwe ike kwụsị ụdị mwakpo dịka ndị otu ha wakporo Omeiwu Ike Ekweremadu n’izu gara aga na Nuremberg, Germany.

Mz. Chika Edoziem, Onyeisi Directorate nke Steeti, kwuru nke a n’Awka, Anambra Steeti.

O kwuru na ndị ọchịchị nke South-East nwere ike ichegharị  ma chigharịa; mana ọ bụrụ na ha emeghi otu a, ndị otu IPOB ga na-awakpo ha kwa mgbe kwa mgbe.

IPOB kwuru na ha na-ele anya itinye aha ndị ọchịchị ndị ọzọ na ndị ha ga-awakpọ n’ihi na ndị a sokwa na ndị na-emebisi obodo a.

Ha kwuru na dịka ha na-agba mbo inweta nwere onwe, na o nweghi onye ga-egbochi ha.

O kwuru na ewumewu mba ofesi ga-amụ akụkọ mmebọ ndị ọchịchị Naịjirịa, n’ihi na mgba ha na-agba ugbua bụ nke ọgbọ ọgụ ya bụ mba ofesi, ebe anya ga na-ahụ ma na-edetu.

Leave a Reply