Igbo News

IPOB ebola FG ebubo igbusisi ndi bi n’ụlọ Nnamdi Kanu n’Ụmụahịa

Views

Ndi Indigenous People of Biafra. IPOB, ebola gọọmentị etiti na Gọvanọ Abia State, Okezie Ikpeazụ ebubo maka nkata ha kpara igbu ndi ezinaụlọ Nnamdi Kanụ, ndi bi n’ụlọ ya nke dị n’Isiama, Afaraukwu n’Ụmụahịa.

N’okwu nke Emma Powerful kwuru, o mere ka a mara na ndi nchekwa obodo; ndi ji ngwa agha, kwuchiri n’ihu ụlọ Nnamdi Kanụ.

O kwuru na Gọọmentị Etiti na Okezie Ikpeazụ edosala ndi Fulani, ka ha memila ndi Afaraukwu Ibeku; ndi aka ha dị ọcha nakwa onye ọ bụla ha nwetara na-agaghari n’ụlọ Nnamdi Kanụ.

Ọ na-akpọku ndi otu mba ụwa na ndi Naijiria ka ha mara ihe na-emenụ. Ọ gwara otu ndi a kwagide Okezie Ikpeazu na ndi otu ya ka ha kpọpụ ndi ogbu mmadu ha kpọsara n’ihu ụlọ Nnamdi Kanu.

Powerful kwuru na Okezie Ikpeazu na ndi otu ya ga-aza ajụjụ gbasara onye ọ bụla egburu n’Afaraukwu.

Leave a Reply