Igbo News

Imo bomb blast: Gọọmenti akasiela ndi ọnwụ metụtara obi

Views

Osote onye ọchịchị Imo steeti bụ Gerald Irona gara leta ndi Eziorsu n’Oguta local gọọmenti dị n’Imo Steeti maka ụmụnne ha nwụrụ n’ogbunigwe dara ụbọchi Tọọzdee. Irona kasiri ndi a obi ma gwakwa ha na gọọmenti steeti na-akwado ha.

O kwuru na ha na-agba mbo ịhụ n’ụdị ihe ahụ emeghi ọzọ. Ọ gbara ndi bi ebe ahụ ume ka ha hara itinye iwu n’aka ha ma rịọkwa ha ka ha dere duu n’ihe mere. O kelekwara ndi nchekwa obodo maka itinye ọnụ n’ihe mere.

Rabiu Ladodo bụ kọmịshọna ndi uwe ojii kọwara na ihe merenu bụ na otu onye na-ere akpakara na-akugwo igwe mgbe ogbunigwe a gbara. Mmadu abụọ ndi ọzọ nwụrụ bụ onye kwụ n’akụkụ ya na onye ọzọ na-agafe agafe.

Rabiu gwara ndi Imo steeti ka ha kpachara anya ha n’ebe ihe gbasara igwe nọ. O kwukwara na ya na ndi otu akpakara ga-enwe nzukọ ka ọ dọọ ha aka na nti gbasara igwe.

Onyeisi ndi Eziorsu bụ Prince Emmanuel Ukade kelere gọọmenti steeti maka obi ọ bịara kasie ha. O kwuru na ọṅụ juru ha obi n’ihi na nke a gosiri na gọọmentị agbakụtaghị ha azụ.

Gọọmentị steeti Imo nyere ezinaụlọ ndi nwụrụ anwụ ego iji kwado ha.

Leave a Reply