FeaturedIgbo News

Ikpeazu enye iwu ka e mechie ‘Bakassi Industrial Market’ Aba

Views

Gọvanọ na-achị Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu enyela iwu ka e mechie ahịa Umuehilegbu/Bakassi Industrial Market nke dị n’Aba. Ọ gakwara n’ihu chụọ ndị isi na ndị niile na-ahụ maka ya bụ ahịa

O nyere iwu a n’ozi nke ‘Chief of staff’ ya; Anthony Agbazuere binyere aka ma nye ndị mgbasaozi n’Umuahia ụbọchị Mọnde.

Ihe kpatara mmechi a bụ ọgụ ndị mmadụ lụsoro ndị Mgbanyụọkụ Abia steeti n’Ahịa ahụ.

Ikpeazu nyekwara iwu ka ndị uweojii chekwaba ahịa ahụ ma nwụchie ndị niile so me ya bụ arụ maka ntaramahụhụ ruru ha.

5 Comments

Leave a Reply