FeaturedIgbo News

Ihedịọha ga-etinye ego ruru ijeri naira anọ n’agụmakwụkwọ

Views

Gọọmenti Imo Steeti ekwuputala na ha ga-etinye ego ruru nde naịra anọ n’agụmakwụkwọ nke steeti.

Onyeisi oche Imo State Basic Education Board (IMSUBEB), Ọkz. Obiọma Iheduru gwara ndi nta akụkọ na Owerri ụnyahụ na Gọọmentị na-atụ alo imezigharị ụlọakwụkwọ otu narị na iri anọ ma rụkwa ndị ọhụrụ. A ga-azụkwa ndị nkuzi ruru otu puku na steeti ma gbapuo ebe a na-agba mmiri na ihe ndị ọzọ.

Iheduru kwuru; ‘anyị abiala ịtọ ntọala ezi agụmakwụkwọ. Mgbe anyị batara, anyị gagharịrị n’ ụlọakwụkwọ nke steeti a, ma nwere aka anyị họrọ ndi a ga-emezi.  Ihe ọ ga-eri anyị bụ Ijeri naira atọ, nde puku naira itolu (3.9bn).’

O kwuru na nyocha ha mere gosiri na ndi nkuzi dị ụkọ; ya mere, ha ga-azụ ndi nkuzi ka ụmụ akwụkwọ nweta ezi agụmakwụkwọ.

 

Leave a Reply