Igbo News

Ihedioha achụọ ndi isi lokal gọọmenti n’Imo Steeti

Views

Emeka Ihedioha bụ gọvanọ Imo Steeti enyela ndi isi lokal gọọmenti iri na asaa na ndi na-esote ha oche azụ. Inye oche azụ metụtakwara ndi Councillor narị iri anọ na ise n’Imo Steeti. Ihe o mere bụ ka o mezuo ihe e dere na agbata nke anọ, ise na isii n’iwu nke Imo Steeti.

Mgbe o mechara nke a, Gọvanọ Imo Steeti hibere kọmiti di iche iche na lokal gọọmenti niile.

Ihedioha chụkwara ndi niile nọ n’ụlọ ọrụ INEC nke steeti ya. O kwuru na ndi niile o nyere oche azụ ga-anọ otu ahụ ruo ọnwa isii.

Ndi omeiwu steeti kwadoro omume Ihedioha ma nyekwa iwu ka ndi a oche azụ a metụtara nyefee ihe niile ha ji arụ ọrụ n’aka ndi isi ọrụ bekee.

Leave a Reply