FeaturedIgbo News

Ihe ndị ọchịchị Naịjirịa ga-eme ma ha gaa mba ofesi iji gbochi mwakpo ndị IPOB

Views

Minstrị na ahụ maka mmekọrịta mba ofesi agwala ndị ọrụ gọọmentị, ndị na-aga mba ofesi, ka ha gwa ministrị ha nakwa ụlọ ọrụ na-ahụ maka Naịjiria n’obodo ha na-aga, ka enwe ike chekwa ha.

Mz. Ferdinand Nwonye, onye nkwuchiteọnụ minstrị a kwuru nke a na Wenesde n’Abuja.

N’okwu nke ya, mz. Ferdinand kwuru:

‘Ndị Ministrị nke Foreign Affairs katọrọ mwakpo nke ndị IPOB wakporo Omeiwu Dkt. Ike Ekweremadu, mgbe ọ gara emume nke ndị Igbo haziri na Nuremberg, Germany.

‘Ministrị a na-echetara ndị isi obodo a ka ha gwa minstrị a nakwa ụlọ ọrụ na-ahụ maka Naijirịa n’obodo ha na-aga, ka akwado etu a ga-esi kpuchite ha’.

‘Nke a ga-enyere minstrị a aka inyocha obodo ha na-aga ma gwakwa ndị nchekwa obodo ahụ ka elebara ha anya’.

O kwuru na nke a abụghị ka enwe ike inyocha omume ha, kama ọ bụ ka ekpuchite ha.

Leave a Reply