FeaturedIgbo News

Ihe mere na agbanyụghị ọkụ Ọnicha n’oge- Onyeisi ụlọọrụ mgbanyụ ọkụ Anambra

pictures: Nairaland.com
Views

I ji gosipụta mbọ na  nchọpụta ihe kpatara na enweghị ike ịgbanyụ ọkụ Onitsha n’oge, Gọvanọ Willie Obianọ gara n’ ụlọọrụ mgbanyụ oku Anambra Steeti n’ ọka.

Ka Mazị Martin Agbili bụ onyeisi ndị ụlọọrụ mgbanyụ oku Anambra Steeti, na-egosi Gọvanọ gburugburu ụlọọrụ ha na ụfọdụ ngwa ọrụ, ọ gwara Gọvanọ na ha enweghị ike ịwuchi ebe ahụ n’oge n’ihi na ndi ọrụ mgbanyụ ọkụ kaara ịga ebe ahụ bụ ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ ngalaba ahịa Ọnicha, mana ha na-agbanyụ ọkụ ebe ọzọ.

Mazị Agbili mere ka amata na mgbe ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ rutere ebe ahụ, ndị mmadụ nọ na-achụgharị ha nke mere ka ndị ọrụ ya jisi ike zọba isi onwe ha.

 

Onyoonyo si na: Nairaland.com

Leave a Reply