Igbo News

Ihe mere m ji ahọrọ ụmụnwanyị dika minista akụnụba nke Naijiria: Buhari

Views

Onyeisi ala Muhammadu Buhari egosipụtala ihe o jiri tụkwasị ministri na-ahụ maka akụnụba n’aka ụmụnwanyị kemgbe 2015 ọ batara n’ọchịchị. Ọ kọwara na ihe mere o ji eme otu a bụ maka ụdị ntụkwasị obi o nwere n’ebe ụmụnwanyị nọ.

O kwuru nke a mgbe ọ nabatara ndi nnọchịanya ụmụnwanyị Naijiria na wenezdee na Presidential Villa. O kwere ha nkwa na ọ ga-enye ha ọtụtụ ọnọdụ n’okpuru ọchịchị ya.

Dkt. Hajo Sani bụ onye enyemaka onyeisiala n’ihe gbasara nlekọta ,‘Special Assistant on Administrative’ kwuru nke a:

            “Anyi ma na I bu anyị n’obi, na ị makwara na anyị nwere ụmụnwanyị dị ike ọrụ na ndi ga-ewetara gi uru n’ọchịchị nke a. Ya mere, ị ga-agbali ka itinye ụmụnwanyị n’ọchịchị’.

I lee anya, I ga-ahụ n’ezie na ọ bụ ụmụnwanyị na-ahụ maka akụnụba n’okpuru ọchịchị Buhari. N’afọ 2015, mgbe Buhari rigoro di ka onyeisi ala Naijiria, ọ bụ Kemi Adeosun ka o mere minister na-ahụ maka akụnụba. Mgbe Kemi rituru n’ọrụ a n’afọ 2018, ọ bụ Zainab Ahmed ka ọ họrọ ka ọ nochie Kemi Adeosun. Mmadu abụọ Buhari tinyere n’ọkwa a bụ ụmụnwanyị.

Leave a Reply