FeaturedIgbo News

Ihe mere anyị jiri wakpo Ekweremadu: IPOB

Views

Ndi Indigenous People of Biafra (IPOB) na Sọnde ekwuola ihe mere ha jiri wakpoo Osote Onyeisi Ụlọ omeiwu gara aga bụ Ike Ekweremadu na Germany.

A wakporo Ekweremadu na Germany, ebe ọ gara emume iri ji ọhụrụ nke ndi Igbo bi na Germany.

Na mmeghachi ahụ maka nke a, ndi IPOB kwuru na e nyere ha iwu ka ha wakpoo ndi ọchịchị ndi Igbo, mgbe ọ bụla a hụrụ ha n’akụkụ obodo ọ bụla.

Ha kwuputara na ndi ọchịchị ha ka ga-awakpo gunyere: David Umahi nke Ebonyi, Ifeanyi Ugwuanyi nke Enugu, Okezie Ikpeazu nke Abia na Willie Obiano nke Anambra.

Otu a kwuru na Onyeisi Ọhanaeze Ndigbo, Nnia Nwodo sokwa na ndi atụrụ aka na-a ga awakpo n’ihi na ọ kwadoro Operation Python Dance e mere na 2017

Ha kwuru na mgbe ọ bụla a hụrụ ndi a na mba ofesi, na ha ga-emebọ ha.

Leave a Reply