Igbo News

Ihe mere e jiri NBC mechie AIT, Ray Power

Views

Otu na-ahụ maka mgbasaozi na Naijiria bụ National Broadcasting Commission (NBC) anapula ndi AIT na Raypower ikike igbasa ozi. Onye kwuru nke a bụ onye ntuziaka NBC bụ Malam Is’haq Mosibbo-Kawu n’ụbọchị Tọọzdee n’Abuja.

Kawu kwuru na kemgbe afọ abụọ gara aga, ndi NBC na-akpọku ụlọọrụ AIT na Raypower maka ụdị ozi ha na-agbasa. Mana ndi AIT fooro ntutu taa na ha agaghi eme ihe di n’iwu mgbasaozi.

Ụdị ozi AIT na Raypower na-agbasa dika ndi Sahara Reporters siri kowaa, bụ nke nwere ike ibute nsogbu n’ obodo a. Ndi NBC chọpụtara na ha na ekwu ụfọdụ okwu na-adighi mma dịka: ‘abụọla Naijiria ọnụ’, ‘anyị na-ekwuputa nwere onwe nke Niger Delta’, ‘Naijiria na-agbakasị m ahụ’ na okwu ndi ọzọ.

Okwu ndi a bụ na-ebute ọgbaghara n’obodo, ya mere ndi NBC jiri mechie ụlọọrụ ndi a.

Leave a Reply