FeaturedIgbo News

Ihe mere anyị jiri chọọ imepụta otu ndi nche: MACBAN

Views

Otu ndi Fulani na-achị ehi bụ Miyetti Allah Cattle Breeders Association of Nigeria (MACBAN) ekwuputala ihe ha jiri chọọ imepụta otu ndi nche n’Ọwụwa anyanwu nakwa n’akụkụ Naijiria ndi ọzọ.

Onye ode akwụkwọ ndi MACBAN bụ Baba Othman Ngelzarma gwara ndi Sun na ime ihe dị otu bụ ụzọ ha si enyere gọọmentị aka ịkwụsi ogbugbu na ntọrọ mmadu n’obodo a.

O kwuru na ha chọrọ isi n’ụzọ dị otu a nyere ndi nchekwa obodo a aka ma mee ka udo di maka na nchekwa bụ ọrụ onye ọ bụla n’ụzọ nke ha. Ọzọkwa bụ na, naani onye Fulani nwere ike ịchọta ndi ohi bụ ndi Fulani. Ya mere, ọ gaghị ara ahụ ịchọta ndi ohi ma kpọpụta ha ka ekpee ha ikpe.

Ihe a ka o kwuru bụ ebumnobi ha nke ndi mmadu na-aghọtaghị. O kwukwara na ha dị njikere inyere ndi nchekwa obodo na gọọmenti aka ichekwa obodo a. Mana o nweghi mgbe ha ga-eme nke a ma gọọmentị akwadoghị ya.

 

Leave a Reply