FeaturedIgbo News

Ihe mere anyị ji awakpo ndi mmadu: Ndi Fulani cheghariri echeghari

Views

Ụfọdụ ndi Fulani cheghariri echeghari na Tsafe LGA nke Zamfara Steeti na Mọnde kọwara ihe mere ha jiri were ngwa agha awakpo ndi mmadu bi n’obodo ahụ. Ha kwuru nke a na nzukọ ha were na Tsafe.

Na nzukọ a nke ha nwere na be Emir nke Tsafe, Muhammadu Bawa, otu n’ime ndi Fulani a, Hassan Dantawaye kwuru na ọha obodo na ndi gọṅmentị na-emeso ha omume ọjọọ.

O kwuru na ndi uwe ojii na otu vigilanti nke a na-akpọ ‘Yan Saki’ na-emenye ha ụjọ ma na-eyi ha egwu. nke a ka o kwuru mere ka jiri bụrụ ndi ntọrọ mmadu. O kwuru na ha anaghi aga ahịa ma ụmụ ha anaghi agakwa akwụkwọ n’ihi na ebe ọ bụla ndi nchekwa obodo a hụrụ ụmụ ma ọ bụ nwunye, ha na-egbu ha. Mgbe ọ bụla ndi nchekwa obodo na-anwụchi ha ma na-eme ka ha mefuo ọtụtụ ego tụpụ akpọpụta ha. Ihe ndi a mere ha jiri tinye aka na mwakpo ụlọ ndi mmadu.

Onyeisi ndi Fulani a, Alhaji Madele kelere gọọmentị steeti ma na-arịọ ndi nchekwa obodo ka ha kpuchite ha n’aka ndi ‘Yansakai’ na ndi ọzọ na-eyi ha egwu. O kwuru na ha ekwerela ịnabata udo na kwe nkwa ịkpọpụta ndi niile ha ji eji.

Leave a Reply