FeaturedIgbo News

Ihe mberede okporoụzọ erie isi mmadụ abụọ n’Ogun

Views

Mmadu abuo anwụọla, ebe mmadụ ise merụrụ ahụ n’ihe mberede okporoụzọ  metụtara ụgbọ ala na ọgba tum tum n’akụkụ Mowe n’okporoụzọ si Lagos gaa Ibadan n’abalị Satọde.

Onyeisi na-ahụ maka ndị Federal Safety Corps n’Ogun steeti, Mazị Clement Oladele, na Sọnde gwara News Agency nke Nigeria na ụgbọala ahụ nwere akara ndebanye APP721ET,  na-aga Ibadan site na Lagos mgbe ọ danyeere ọgbatumtum nwere akara SRA156WE na mpaghara Olowotedo nke Mowe.

O kwuru na mmadụ asatọ so n’ihe mberede ahụ.

N’okwu nke ya, Oladele kwuru, “Edebela ozu ndị ahụ nwụrụ anwụ n’ebe a na-echekwa ozu n’ ụlọọgwụ Divine Touch, Mowe, ebe ndị merụrụ ahụ na-anata ọgwụgwọ n’ụlọ ọgwụ ahụ.”

Ọ dụrụ ndị ọkwọ ụgbọala ọdụ ka ha kpachara anya ma na-agbasochi anya na 50km kwa elekere iji zere ihe mbere nwere ike ibute ọnwụ.

Leave a Reply