Igbo News

Ihe gọọmenti ga-eme maka agụmakwụkwọ: Buhari

Views

Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari ekwuola ihe ndi ọ ga-eme n’afọ anọ o nwere ịchị obodo Naijiria.

O kwuru na ya na gọọmentị steeti na local gọọmentị niile ga-ejikọ aka ọnụ ịhụ na o nweghi nwata Naijiria ọ bụla na-agaghị aga akwụkwọ.

O kwuru na gọọmentị ya dị njikere ịrụ ụlọ akwụkwọ n’ebe mmụta niile, zụọ ihe ndi eji akụzi ihe, wepụta usoro nkuzi nakwa mee ka e nwe ndi nkuzi ga-akuzi ihe. Ihe ndi a ga-eme ka e nwee ọmụmụ ihe na-enweghi nsogbu ọ bụla.

Leave a Reply