FeaturedIgbo News

Ihe eji echekwa ozu dị n’anụ ọkụkọ ebubatara ebubata: Onyeisi Customs, Ali

Views

Hameed Ali, onyeisi ndi Nigerian Customs Service (NCS) na Wesnesde, kwuru na nri ndi a na-ebubata na Naijiria were kemikalu, nke na-adịghị mma n’ahụ mmadu.

Ali kwuru nke a n’emume ‘Operation Border Drill’ na Maigari LGA, nke dị na Jigawa, ebe ọ na-agwa ndi ọrụ si NCS na Nigeria Immigration Service okwu.

O kwuru na nri ahịa iwu dịka osikapa na anụ ọkụkọ oyi kpọnwụrụ adịghị mma n’ahụ mmadu. Iji maatụ, o kwuru na anụ ọkụkọ ndi a na-ebubata were kemikalu eji echekwa ozu. Kemikalu a bụ ihe ejikwa echekwa anụ ọkụkọ ndi a maka mmebi.

O kwukwara na osikapa ndi a na-ebubata bụ nke na-eme cancer na ọrịa kidney maka na ndi na-ebubata osikapa na-aga gbagharia ya n’akpa ọzọ ka osikapa nọchara afọ ise n’ime ụlọ ahịa.

Onyeisi ndi NIS, Mohammed Babandede, gwara ndi ọrụ ka ha jide nke ha ji n’ọrụ ha.  Ọ gwakwara ha ka ha gbaa mbọ hụ na  ndi na-abata Naijiria si ụzọ kwesiri ekwesi ma pụọkwa si n’otu ụzọ ahụ.

Ọ gwakwara ha ka gba mbọ hụ na ndi mmadu jizu akwụkwọ njem ha, tụpụ ha apụọ ma ọ bụ bata n’obodo a.

Ọ gwakwara ndi ọrụ a ka ha ghara ịkparị onye ọ bụla n’ihi ọrụ ha.

Leave a Reply