FeaturedIgbo News

Ihe Buhari na ndị ọchịchị ndị Igbo metara na nzukọ ha

Views

Onyeisi ala Muhammadu Buhari akwadola ka ewepụta ijeri naira iri, ego a ga-eji dozie ọdụ ụgbọelu Akanụ Ibiam n’Enugu steeti.

Buhari kwuru nke a na nzukọ ndi gọvanọ na ndị ọchịchị mpaghara ọwụwa anyanwụ na Tọzde, na Presidential Villa, Abuja.

Onyeisi ala kwuru na o doro ya anya na e mechiri ọdụ ụgbọelu kemgbe Ọgọstụ. O kwuru na ọchịchị ya ga-eme ihe niile ha kwesịrị ime iji dozie ọdụ ụgbọelu na ebe ndị ọzọ ekwesiri ilebara anya n’obodo a.

Buhari kwuru na o doro ya anya na ọ bụrụ na e mezie ụzọ, okporo igwe na ọkụ eletrik, na ndị Naijiria agaghị enwe nsogbu ọ bụla ime njem n’obodo a.

Ọ rịọrọ ndị gọvanọ ka ha kọwara ndị mmadu, ndị ha na-achị, na gọọmentị na-agba mbọ idozi ebe niile. O kwukwara na ha na-enwere ọtụtụ nsogbu mana ha na-agbalị ka ike ha ha.

N’aha ndị gọvanọ mpaghara ọwụwa anyanwụ, Gọv. Ụmahị kelere Buhari maka ọrụ ọ na-arụ na mpaghara ọwụwa anyanwụ, ọkachasi n’ọkwa mmiri nke Niger.

O kwukwara okwu maka ọnọdụ ụzọ Naijiria ma rịọ gọọmentị ka o leba anya n’ụzọ ndị.

Leave a Reply