Igbo News

Ihe Atiku kwuru maka enweghi nchebe na ntọrọ na ozi oziri na Sal

Views

Atiku Abubakar bụ onye zọrọ ọchịchị onyeisi ala n’okpuru People Democratic Party (PDP) ekelela ndi Muslim dịka ha na-eme emume nkwụsị ebumọnụ Ramadan. O siri n’igwe ‘Facebook’ zie ndi Naijiria na ndi gọọmentị steetị ozi ka ha chọọ ikpe ziri ezi na udo na-agbanyeghi nsogbu enweghi nchebe dị n’obodo.

Atiku kọwara Naijiria dịka ebe oke ịda ogbenye dị ma na-arịọ ndi ọchịchị ka ha teta n’ụra ma mee ihe kwesịrịnụ.

N’ okwu nke ya, Atiku siri:

‘Dịka anyị na-eme emume nkwụsị Ramadan, ọ dị mkpa ka anyị ghọta na ọnwa dị nsọ a bụ maka igbanwe onwe anyị site na iwepụ anya n’ebe anyị nọ ma lekwasị anya n’ebe ndi ọzọ nọ. Mgbe a na-eme Ramadan, anyị buru ọnụ ka anyị we nwee ọmịiko n’ebe ndi ogbenye na ndi ụwa na-atu n’ọnụ nọ. Ugbua anyị buchara ọnụ, anyị ga-eche eziokwu a ihu, nke bụ na Naijiria so na mba kachasi daa ogbenye n’ụwa niile’.

Ọ gwara ndi Muslim na ekpere ha kpere etinyele ha n’ọnọdụ ịchụ aja nke ga-ebughachi ikpe ziri ezi, udo, ịdị n’ otu na agamnihu n’ala anyị. N’ikpeazụ, ọ rịọrọ Chineke ka Ọ gozie ha ma goziekwa Naijiria ma weghachi udo n’ala a.

Leave a Reply