Igbo News

Ihe anyị ga-eme Buhari ma ọ bata Japan: IPOB

Views

Ndi Indigenous People of Biafra, IPOB, na Fraide, gwara ndi otu ya nọ na Japan, ka ha jide Onyeisi ala Muhammadu Buhari mgbe ọ bụla ọ batara n’obodo ahụ.

IPOB gwara ndi otu ka ha jide Buhari ma nyefee ya n’aka ndi nchekwa na Japan, n’ihi na Buhari abụghị onye echere na ọ bụ.

Buhari ga-ahapụ Abuja na Sọnde ma gawa Japan, ka o nwee ike isonye n’emume Seventh Tokyo International Conference on African Development (TICAD7), nke a na-eme na Yokohama, site na 28 ruo 30, nke ọnwa Ọgọstụ, 2019.

Ndi IPOB ka na-esi ọnwụ na Buhari bụ Jubril Al-Sudan, wee na-agagharị dịka Onyeisi ala Naijiria.

Emma Powerful, onye nkwuchiteọnụ IPOB kwuru, ‘enyela ndi otu anyị nọ na Japan iwu ka ha hụ na-ejidere Jubril Al-Sudani, onye na-agagharị dịka Onyeisi ala Muhammadu Buhari, mgbe ọ bụla ọ tụrụ ụkwụ na Japan’.

O kwuru na ọ bụghị naanị na Buhari bụ onyeisi ala adigboroja, ọ chọrọ ikpochapụ ndu ndi mmadu, ọ kachasị n’ala Biafra.

Leave a Reply