FeaturedIgbo News

Ndị Uweojii ekee Nkwụcha maka Ngagharị ndị Shiites

Views

Onyeisi ndi uwe ojii, Mz. Mohammed Adamu, kwuru na emume niile nke ndị Islamic Movement in Nigeria (IMN) bụ nke na-eyi ọha egwu.

Onye Force Public Relation Officer, Frank Mba kwuputara nke a n’akwụkwọ ozi, na Mọnde, n’Abuja.

O kwuru na nzukọ niile ma ọ bụ ngagharị nke ndị Shiites na-eme bụ nke na-esoghi n’iwu ma bụrụkwa ụzọ ha si akwado iyi ọhanaeze egwu.

Mba kwuru na eziela ndị uwe ojii na mpaghara Naijiria niile ka ha chebiri ndị IMN maka ngagharị ha ga-eme na Tuzde.

O kwuru na ngagharị a bụ ụzọ ndi Shiites ji etisa udo, iwu na nchekwa nke obodo a.

Ọ gwakwara ọhaneze ka ha nye ndị uwe ojii ozi nke ha maara ndi mkpa maka emume ndi Shiites ma gwakwa nne na nna ka ha jide ụmụ ha ka ha ghara isonye n’emume ndi na-adabaghi n’iwu nke Naijiria.

Leave a Reply