FeaturedIgbo News

Mmiri ide emebie ọtụtụ ihe n’Adamawa

Views

Gọọmentị nke Adamawa Steeti na Satọde ekwuola ka  mmiri ide siri mebie ọtụtụ ihe na Jimeta nke dị naYola North LGA, nakwa na Yola Town nke dị ma Yola South LGA.

Onye ntụziaka nke Adamawa State Emergency Management Agency (ADSEMA), Dkt. Muhammed Suleiman gwara ndi nta akụkọ Yola na ide mmiri a metụtakwara Girei, Shelleng na Ganya LGA nke Steeti ahụ.

Ihe butere  mmiri ide a bụ mmiri ozuzo nke bidoro n’ụtụtụ Fraide wee ruo n’ehihie ụbọchị ahụ. Ụdị ide mmiri nke butere mere na ndị mmadụ enweghi ike ịbanye n’ụlọ ha.

Ma rutekwa Satọde, ide mmiri a ejweghi ndị mmadụ megharịa ahụ. Ụfọdụ ndị gara ọrụ ahụghị ụzọ nlọta.

Suleiman kwuru na o nweghi onye nwụrụ n’ide mmiri ahụ.

Leave a Reply